Jeremiah 10

Chineke na arụsị

1Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel. 2Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ,
unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe,
ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
3Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru.
Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi,
nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
4Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,
jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike,
ka ọ ghara ịda.
5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,
ha adịghị ekwu okwu.
A na-ebugharị ha nʼaka
nʼihi na ha adịghị eje ije.
Unu atụla ha egwu,
nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ,
ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”

6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị.
Ị dị ukwuu.
Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?
Ọ bụ gị bụ eze mba niile.
Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,
na nʼalaeze niile,
ọ dịghị onye dịka gị.

8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.
Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,
site na Ụfaz bubata ọlaedo.
Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma
ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.
Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.
Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.
Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
11“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”

12Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.
Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
13Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.

14Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.
Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;
ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
15Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,
mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,
tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

Mbibi nke na-abịa

17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼoge a, aga m amafu
ndị niile bi nʼala a.
M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,
meekwa ka ndị iro ha jide ha.”

19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.
Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,
“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
20Ebibiela ụlọ ikwu m,
e tibisiala ụdọ ya niile.
Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.
Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,
maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.
Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị,
ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma,
igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
22Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,
oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu,
ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu,
ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.

Ekpere Jeremaya

23O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,
na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
24Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị,
ma ọ bụghị site nʼiwe gị,
ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
25Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche
bụ ndị na-amaghị gị,
wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị.
Nʼihi na ha eripịala Jekọb,
ha eripịala ya kpamkpam,
bibiekwa ebe obibi ya.
Copyright information for IboBIU